Nehemiah 2

Nehemaya abịaruo Jerusalem

1Nʼọnwa Nisan, nʼiri afọ abụọ nke ọchịchị eze Ataksekses, mgbe e wetaara eze mmanya. E buru m mmanya ahụ bugara ya eze. Ugbu a, o nwebeghị mgbe ọbụla m jirila ihu mgbarụ bịa nʼihu eze. 2Ya mere, eze jụrụ m, “Gịnị mere ihu gị ji gbaruo mgbe ọ dịghị ọrịa ji gị? Nke a na-egosi naanị na obi jọrọ gị njọ.”

Ụjọ tụrụ m nnọọ nke ukwu.
3Azara m eze sị, “Onyenwe m, ka ọchịchị eze dị ogologo ndụ. Gịnị ga-eme ka obi dị m ụtọ ebe ọ bụ na obodo ahụ e liri nna nna m ha aghọọla mkpọmkpọ ebe, nke a kpọkwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ?”

4Eze sịrị m, “Ọ bụ gịnị ka ị chọrọ?”

Mgbe ahụ ekpere m ekpere nʼobi m nye Chineke,
5ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.”

6Eze sịrị m, ebe nwunye ya nọkwa nʼakụkụ ya, “Ije gị ọ ga-abụ ruo olee mgbe, olee mgbe ị ga-alọghachitekwa?” Ọ masịrị eze i ziga m. Ya mere, enyere m ya oge.

7Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda. 8Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m. 9Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.

10Ma mgbe Sanbalat,
Bụ onyeisi ọchịchị na Sameria.
onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka.

Nehemaya eledo Mgbidi Jerusalem

11E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ, 12eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba.

13Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu
Ọnụ ụzọ ama a dị nʼọdịda anyanwụ nke mgbidi Jerusalem, 2Ih 26:9; Neh 3:13.
ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa,
Agwọ, nʼokwu ịma atụ
sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa.
Ọnụ ụzọ ama dị nʼebe a na-ekpofu ahịhịa, bụ ọnụ ụzọ ndị Juu na-esite mgbe ha na-edupụ ụmụ anụmanụ e ji achụ aja, ị duru ha jeruo Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Gụọ akwụkwọ Neh 3:14; 2Ez 23:10
Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere.
14Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee. 15Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu. 16Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ.

17Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.” 18Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya.

Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge.

19Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?”

20Ma azara m ha sị, “Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gara anyị nke ọma. Anyị onwe anyị bụ ndị ohu ya ga-amalite iwughachi mgbidi a, ma unu onwe unu, unu enweghị oke maọbụ ọnọdụ ziri ezi maọbụ ihe ncheta ọbụla nʼime Jerusalem.”

Copyright information for IboBIU